Waters of Life

Biblical Studies in Multiple Languages

Search in "Igbo":
Home -- Igbo -- Matthew - 033 (Baptism of Christ)
This page in: -- Arabic -- Armenian -- Azeri -- Bulgarian -- Chinese -- English -- French -- Georgian -- Hausa -- Hebrew -- Hungarian? -- IGBO -- Indonesian -- Javanese -- Latin? -- Peul -- Polish -- Russian -- Somali -- Spanish? -- Telugu -- Uzbek -- Yiddish -- Yoruba

Previous Lesson -- Next Lesson

MATIU - CHEGHARIANU, N'IHI NA ALAEZE NKE KRAIST NO N'AKA!
Ọmụmụ ihe na Oziọma Kraịst dika Matiu
NKEBI NKE 1 - OGE MMALITE NKE IJE-OZI NKE KRAIST (Matiu 1:1 - 4:25)
B - JON BAPTIZIM DOZIRI UZO KRAịST (Matiu 3:1 - 4:11)

2. Baptizim nke Kraịst (Matiu 3:13-15)


MATIU 3:13-15
13 Mbe ahu Jizos siri na Galili biakute Jọn na Jọdan ka o me ya baptizim. 14 Jọn we chọ uzọ igbochi ya, si, Ọ di nkpà ka I mem baptizim, ma i nābiakutem? 15 Ma Jizos zara, si ya, Kwere ya ubu a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mgbe ahụ o kwere ya.
(Lee Mak 1: 9-11; Luk 3: 21-23; Jọn 1: 21-23)

Jọn Baptist chịkọtara ndị chegharịrịnụ, ndị dịka ubi a zụrụ maka ịgha mkpụrụ maka ozi ọma na-abịanụ, na Ndagwurugwu Jọdan. Ọ bụ Chineke họpụtara ndị obi ha tiwara etiwa ka ha bụrụ mmalite ọgbakọ ya. Akụkọ ihe mere eme nke obodo Chineke amaliteghị na nnukwu ụlọ nsọ, kama n'ọzara ọzara.

Na mberede, Jizọs si Nazaret lọta mgbe o jere ije ụbọchị abụọ, sorokwa Jọn na ndị otu chegharịrị. O putara ihe site na mgbe mbu ha zutere na John bu ezi onye amuma, n'ihi na obu onye Jizos mara. Imirikiti ndị mmadụ amaghị Jizọs nwa Meri, mana ndị nwere anya ejiri mmụọ nsọ tee mmanụ hụrụ Jizọs na ike nke mmụọ ya.

Jizos biara ka eme ya baptizim, ma Baptist, onye nakpọ onye nmehie obula ka eme ya baptizim ma tipia ya, megidere onye Nazaret ahu nihi na o huru idi nso ya. O kwetara n’olu dara ụda: Jizọs bụ naanị nwoke ekwesighi ịsacha onwe ya, ma ọ bụ gbanwee obi ya, maọbụ ka achọrọ ịmalite ndụ ọhụụ ebe ọ bụ na ọ nweghị mmehie. Jizọs bụ Ebe Kasị Nsọ, Onye Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile bụ Chineke n’onwe ya. John kwenyere na Chi nke Jizos site na mgbe izizi o zutere ya.

Na ọnụnọ Kraịst, Jọn matara na ọ bụ onye dị ala, mmehie nke ya, na mkpa ọ dị ime onwe ya baptizim, ya mere ọ rịọrọ Jizọs ka o mee ya baptizim. Otua, onye Baptist mebiri n’ihu onye nwe ya we rara onwe ya nye ya. O ji obi umeala nyefee ụmụazụ ya n’aka Kraịst.

Kraist jụrụ echiche nke Baptist ma kọwaara ya na ya abịaghị ikpe ikpe mana ka a kpee ya ikpe n'ọnọdụ mmadụ niile. Ya mere Kraist aputagh site na nmalite nke ochichi ya dika eze di nganga ma obu onye amuma nke na agba aka na nti, kama dika nwa aturu Chineke di ume ala nke nebupu nmehie nke uwa, jikere iburu ikpe nke Chineke nonodu ayi.

Jizọs anọghị n’eluigwe ma dịkwa elu, nke kewapụrụ iche na ndị mmehie. Ọ gbadatara na mmiri nke nchegharị ma wepụ mmehie anyị. Jizos mere ka uzo mbu ya nobe mbu site na ubochi mbu nke ozi ya, ebe omara na odigh uzo ozo ozo gesi mee ka ayi zie ezi ma zoputa uwa. Chineke ji àjà dị ukwuu Jizọs chụrụ gosi ezi omume ya na ikpe ziri ezi ya. Ọ bụ ezie na ọ na-agu ndị mmehie ikpe n’enweghị nsogbu, ọ gụzuru ikpe anyị n’elu obe nke otu Ọkpara Ọ mụrụ naanị ya. Naanị n’ime Kraịst ka emezuru ihe niile eziomume Chineke chọrọ.

Jọn rubeere Onyenwe ya isi ma gosipụta nchegharị site na ido onwe ya n'okpuru. Ya na Jizos rida na miri were ju ya. Kraist nyere Jon ka o keta n’ime uche Chineke mgbe o gwara ya, “otua ka o kwesiri ka anyi mezuo ezi omume nile.” Kraist kwanyeere Baptist ugwu maka ikwesị ntụkwasị obi ya ma were ya dịka onye enyemaka iji mezuo ezi omume Chineke.

Gi onwe gi kwa, onye agu anyi oma, Onye-nwe-anyi kporo ka isonye na igbasa nzoputa nke Chineke site n’okwukwe gi na site n’ozi akaebe gi, nye ndi akpiri na-akpo nku na gburugburu ya ezi omume Ya.

Baptizim nke Kraịst na Jọdan chọpụtara ihe atụ pụtara n ’obe - mgbe Onye A Kpọgidere n’obe mikpuru n’ime mmiri nke Jọdan, buru mmehie nke ụwa wee nwụọ n’ iju mmiri nke oke iwe nke Chineke. Ebe mmeri ya si na mmiri pụta bụ ihe atụ nke mbilite n'ọnwụ ya site na ndị nwụrụ anwụ.

N’ụzọ dị otú a, ihe baptizim Jọn pụtara gbanwere. Ọbụghị naanị ikpe, ọ bụ ụzọ Chineke kpebiri si nweta ndụ ebighị ebi. Ma Kraist choro inye anyi ndu ya.

EKPERE: Ana m efe Gi, Nwa aturu Chineke di aso, nihi na I wepuru nmehie nke uwa. Ibuuru ikpe nke Chineke dika anyi kwesiri. Biko meghee anya m na oke ịhụnanya na nzọpụta gị, ka m wee bụrụ onye ziri ezi ma keta oke n'ezi omume gị. Nyerem aka ikwuputa aha gi ka otutu ndi enyi m we buru onye ezi omume, nihi na amaghm ezi omume obula ma obu nke di n’ime gi.

AJUJU:

  1. Gịnị mere e ji mee Jizọs baptizim na Jọdan n'agbanyeghị na aka ya dị ọcha?

www.Waters-of-Life.net

Page last modified on April 05, 2022, at 04:51 AM | powered by PmWiki (pmwiki-2.3.3)